Psalms 92

Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike.

Ekele maka ịdị mma Chineke

1Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,
na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
2ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ,
na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
3jiri ihe iti egwu ụbọ akwara
na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.

4Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị,
Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
5Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị.
Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
6Ndị uche kọrọ amaghị nke a,
ndị nzuzu enweghị nghọta,
7ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa
ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa,
a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.

8Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.

9Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị,
e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi;
ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
10I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike;
awụsala m mmanụ dị mma.
11Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m;
ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.

12Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ;
ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
13nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị,
ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
14Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi.
Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
15na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi;
ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”
Copyright information for IboBIU